| |
El período embrionario (Las primeras 8 semanas)
Desarrollo embrionario: Las primeras 4 semanas
Capítulo 3 Fecundación
|
| |
| Dika bayoloji si kwuo,
“mmalite otito mmadụ na–ebido na
njikọta spam nwoke na akwa nke nwanyị,”
mgbe nwanyi na nwoke
na- gwọkọta kromozon
iri abụọ na atọ nke ya abụọ
site na njikọta akwara ọmụmụnwa ha.
A na–akpo kari akwara ọmụmụnwa
nke nwanyi “akwa,”
Mana ihe ekwesiri ka-akpọ
ya bụ okite (oocyte)
N’otu aka ahụ, akwara ọmụmụ nke nwoke
ka amara ebe niile dịka “spam”
mana aha akara nabata bu spamatozuunu.
Isoro mgbe ewepụtara otu okite site
na ihe na – echekwa akwa nwanyị
site n’usoro ana akpọ ovuleshion, nke bu mgbe
akwa sitere n’ihe na-echekwa ya pụta,
okite na spamatozuunu na-ejikọta
n’ime otu eriri akpa nwa,
nke a na-akpọ falopian tuub mgbe ụfọdụ.
Eriri akpa nwa na ejikọta
ebe akwa nwanyi na-anọ
na akpa nwa ya.
Ihe ga amalite bụ otu sel ẹmbrayo
nge nke a na-akpọ zaigọtụ,
nke pụtara ntagbade ma ọbụ njikọta ọnụ.
|
Capítulo 4 ADN, división celular y factor temprano de embarazo
|
| |
| Kromozon iri anọ na isii nke zaigọtụ
na - anọchite ihe pụrụ iche nke mbụ
nke bụ njirimara agbụrụ zuru oke
nke mmadụ ọhụrụ ahụ.
Isi atụmaatụ a na - ebiri
n’ime ntachiri ụmụ irighiri ihe
gwọkọrọ agwọkọ nke ana - akpọ DNA.
Ha na–ebu ndụmọdụ maka usoro otito
nke ahụ niile.
Ụmụ irighi ihe a ana akpọ DNA
yiri mbụbe ahikọrọ ahịkọ
nke amara dịka heliks gbara mkpị.
Ihe mebere ụkwụ mbube ndị a bụ ụmụ
irighịri ihe ndị a gbara abụọ abụọ,
ma ọ bụ ihe mgbakasi ukwu
ana-akpọ Gwanine,
sitosin, adenin, na tamin.
|
| Gwanine na sitosin naanị na-agakọta,
ebe adenin na tamin na - agakọtakwa.
Otu n’ime sel ndị a na–enwe
rahurahu njeri atọ
ụmụ ịrigịhi ihe ndia gbara abụọ abụọ.
DNA di na otu sel na–enwe ama buru ibu
nke bụ na ọbụrụ na – etinye
ya n’okwu ederede,
naani ideputa mkpụrụ edemede
mkpado ukwu nke ọbụla
ga–eri iwe ihe kariri mpempe
akwukwọ kariri otu nde na okara!
Ọ bụrụ na edebe ya isi na isi,
DNA nọ n’ime otu sel mmadu na – eru
ihe dịka fiiti atọ na ụzọ otu n’ime atọ
ma ọ bụ otu mita.
|
| Ọ bụrụ na atụghasịa DNA niile
nọ n’ime sel agụgụtaagụta,
Ọ ga – agbati ihe ruru njeri
maili iri isii na atọ
Ogologo ga – esite n’ala ruo
n’anyanwụ ma biagha chikwa
ugboro nari atọ na iri anọ.
|
| Rahurahu awa iri abụọ na anọ ruo n’awa iri ato
mgbe njikọta spam nwoke na akwa nwanyị gachara,
zaigọtụ na - agazụ nkerisi sel nke mbụ.
Site n’usoro nke ana - akpọ mitosis,
otu sel na – agbabi ụzọ abụọ,
abụọ agbabie ụzọ anọ, weediri gawazie.
|
| Site n’ihe dịka awa iri abụọ na anọ rụọ iri anọ na
asatọ mgbe njikọta spam nwoke na akwa nwanyi bidoro,
E nwere ike ichọpụta afọime site
ịchọputa homonụ
nke ana–akpo “nzuko mbido odime nwanyi
n’ime ọbara nne nwa.
|
Capítulo 5 Etapas iniciales (mórula y blastocito) y células madre
|
| |
| Ebe ụbọchi atọ ruo ụbọchị anọ mbe mmekọta
spam nwoke na akwa nwanyi gachara,
nkerisi sel nke ẹmbrayo
na – ewere oyiyi dị gburugburu,
ẹmbrayo a ka ana - akpọ mọrụla.
Abia n’ụbọchi anọ rụọ na nke ise oghere
ga - akpụta n’ime ẹtiti sel nke a
na n’ime ẹmbrayo ka ana – akpozi blastosist.
Sel nọ n’ime blastosist
ka ana - akpọ sel ukwu nke di n’ime
na ewetakwa isi, ahụ,
na akụkụ ndị ọzọ
dị mkpa maka ntoputa mmadụ.
Sel ndị nọ n’ime sel ukwu nke di n’ime
ka ana akpọ “ẹmbrayonic stem cell” maka
na ha nwere ikikere
ime ka otu n’ime ha ruo ihe kariri
nari sel iri abụọ dị iche iche
no n’ime ahụ mmadụ.
|
Capítulo 6 1 a 1½ semanas: implantación y gonadotropina coriónica humana (GCH)
|
| Mgbe ọ gagharichara n’ime eriri akpa nwa,
ẹmbrayo nke izizi na-edewe onwe ya
n’imerime akpa nwa nne ya.
Usoro a ana – akpo nkunye n’ime akpa nwa,
na – ebido na mkpuru ubæchi isii
ma gwuchaa site n’ ụbọchị iri ruo ụbọchị iri na abụọ
mgbe njikọ spam nwoke na akwa nwanyị gachara.
Sel si na ẹmbrayo na – eto eto
ga – ebido mepụtaba homonụ
nke ana - akpọ Human Chorionic Gondotropin
or HCG,
ihe nke anachọ putakari n’otụtụ
nlele eji amata onye dị ime.
HCG na edu homonụ nke nne nwa
ka ọ na – emekụta ọnọdụ nsọ nwanyị,
na – eme ka afọ ime gaa n’ihu.
|
Capítulo 7 La placenta y el cordón umbilical
|
| A na – eso nkunye n’akpa nwa a,
sel ndị di na mpụta nke blastosisti
na – eme ka enwee akụkụ nke ana – akpọ plasenta
[ya bụ ịhe na-ejikọta akụkụ n’ime afọ nke nwanyị na
nwa obu n’afọ. Ebe a ka nwa si enweta nrị ya],
nke na - arụkwa ọrụ dịka ihe na - ejikọta nne
na nwa,
n’ime ka ọbara ha gazuo ahụ niile.
Plasenta na – ebubata ume nne, erimeri,
homonụ na ọgwu n’ ime ahụ mmadụ
ka na – etoputa etopụta;
na-ewepụtakwa ihe niile anụ ahụ
na - achọghị (ya bụ nsị);
ọ nakwa – egbochi obara nne
ka ọ ghara igwakọta n’obara
nke ẹmbrayo na fitọs.
Plasenta na emeputakwa homonụ
na anagidekwa ọnọdụ ahụ ẹmbrayo na fitọs
ka ọdịtụ elu karịa nke nne ya.
Plasenta jikọtara mmadụ nke na-etolite
site n’ime eriri na ejikọta nne na nwa
(ya bụ eriri nwa).
Ike ọche ndu nke plasenta
na nke ndị
nọ n’ụlọ ọgwụ ndị dị ugbua, n’ebe ana –
elebarara ndị ọria na-ria nke ukwu anya biazi hara
|
Capítulo 8 Nutrición y protección
|
| |
| N’izu nke mbụ,
sel nke dị n’ime sel ukwu
na - akpụpụta ogo abụọ ana - akpọ
haipoblastị
nakwa epiblastị.
Haipoblastị na – eme ka enwe
nkochi ime akwa nwa,
nke bụ otu n’ime akụkụ nke
nne si ebuga nri nye
nwa nke na amalite ọkpụkpụ.
Sel si na epiblastị na - ekepụta
mgbidi ana - akpọ amniọnụ,
n’ime nke ẹmbrayo
na fitọs (ya bụ nwa ebu n’afọ) ma emesia
na – eto ruo oge ọmụmụ.
|
Capítulo 9 2 a 4 semanas: capas germinales y formación de órganos
|
| |
| Na rahụrahụ izu abụọ na ọkara,
epiblastị ekeputala
akwara atọ nwere ọrụ ha pụrụ iche,
ma ọ bụ ngidịrigi izizi,
ana - akpọ ektodamụ,
endodamụ,
na mesodamụ.
Ektodamụ na eweputa
ọtụtụ akụkụ
gunyere ụbụrụ,
ọgidigi azụ,
irighiri akwara,
anụ ahụ,
mbọ,
na ntụtụ isi.
Endodamụ na - ekepụta usoro nke
akụkụ okuku ume
na akụkụ ogwugwa nri,
na-ewepụtakwa ọke ogan ndị dị oke mkpa
dị ka umeji
n’ononukporokọ.
Mesodamụ na - akpụpụta mkpụrụobi,
akịrị,
ọkpụkpụ,
katileji [ya bụ ịhe dị na ahụ mmadụdịka
ọkpụkpụ ma na-anọkwa anọ],
mọzụlụ,
sel ọbara,
na akụkụ ndị ọzọgasi.
|
| N’izu atọ
ụbụrụ ekeribela n’ụzọ ato dị mkpa
nke ana -akpọ ụbụrụ dị n’iru,
na ụbụrụ nke dị na etiti,
nakwa ụbụrụ nke dị na azụ.
Ntolite nke akụkụ okuku ume
na nke ogwụgwa nri
na – amalitekwa nke ha.
|
| Dika sel ọbara nke mbụ
na – aputa n’ime nkochi ime akwa nwa,
iko ọbara na amalite itopụta
n’ahụ ẹmbrayo niile,
tuubu nke mkpụrụobi na aputakwa ihe.
N’otu mgbe ahụ,
mkpụrụobi nke na eto ọsọ ọsọ
ekeji sibe n’ime onwe ya
dịka ọnọdụ digasi iche iche
malitekwa tobe.
Mkpụrụobi ga – ebido kụba
n’izu atọ na otu ụbọchi
nke na – esote mmekọta spam nke
nwoke na akwa nke nwanyị.
Ihe na-ebughari mmẹ ẹ n’ahụ n’ile bụ
ihe nke mbụ n’ahụ mmadụ,
ma ọ bukwa otu ogan yiri onwe ha,
na-enweta ọnọdụ na - arụ orụ ofuma.
|
Capítulo 10 3 a 4 semanas: el plegamiento del embrión
|
| |
| N’ime izu atọ na izu anọ,
atumatụ nke ahụ mmadụ na - amalitekwa
di ka ụbụrụ,
ogidigi azụ,
na mkpụrụobi nke ẹmbrayo,
a na – amata ha n’enweghi nsogbu
otu aka ahụkwa, ebe ihe
na-ekochi ime akwa nwa dị.
Otito ọsịsọ na – ebute njikọ
nke ẹmbrayo amarala na ọ di abadaba.
Usoro dị otu a na etinyekọta
mpaghara nkochi ime akwa nwa
n’ime mgbochi
nke sistem na - ahụ maka ogwugwa nri
na akpụpụtakwa eze obi
nakwa oghere dị n’afọ
nke mmadụ na – etote etote.
|