Skip Navigation

National Geographic Society Este programa se distribuye en los Estados Unidos y Canadá por National Geographic y EHD. [obtenga más información]

DVD ilustrado plurilingüe

La biología del desarrollo prenatal


8 a 12 semanas


BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


 

Descargar versión en formato PDF  ¿Qué es PDF?
 

El período fetal (8 semanas hasta el nacimiento)

Capítulo 37   9 semanas: deglute, suspira y se despereza

Oge nke fịtọs ga-aga n’ihu ruo n’oge ọmụmụ nwa.

N’izu itoolu, ịmi aka ebido nwa ebu n’afọ nwere ike ilo mmiri omụmụ.

nwa ebu n’afọ nwekwara ike ijide ihe aka, megharia isi ya ka ọ gaa ihu ma ọ bụ azụ, mepee ma mechikwaa agba ya, megharia ire ya, rie ude nakwa gbatia.

Irighiri akwara nọ n’ihu, nakwa nke nọ n’ọba aka, na makwa n’oba ụkwụ nwere ike ịmata mgbe emetụtara aka dị mfe.

"N’imeghari ahụ maka mmetụta dị mfe n’ọ ọba ụkwụ," nwa ebu n’afọ ga-ehulata ukwu ya na ikpere ya, o nwekwara ike rọkọlata mkpụrụ ụkwụ ya.

Ugbua eluanya emechichala nke ọma.

N’ime ekọ akpịrị, akwara nke eji ekwu okwu na-aputa n’egosipụta mmalite ntoputa nke ebe okwu si apụta.

N’ime ụmụaka ndi nke nwanyi, a ga amata nke bụ akpanwa ya, sel ọmụmụ akabeghị aka, nke ana-akpo ogonia, na-enwoghari n’ime akpaakwa nwa.

Ihe eji ama nke nwoke na nke nwanyi ebidole kewaputasiwa onwe ha dika nke nwoke ma ọ bụkwa nke nwanyị.

Capítulo 38   10 semanas: pone lo ojos en blanco y bosteza, aparecen las uñas y huellas digitales

Otito di egwu ana-enwe n’ime izu nke itoolu na nke iri na ebuli arụ nwa n’ihe kariri pasenti iri asaa na ise.

N’izu nke iri mmetuta nke nkuanya nke elu n’akpata igwodata anya ala.

nwa ebu n’afọ na-eghe ughere ma na-emepekwa na-emechi ọnụ ya kwa mgbe kwa mgbe.

Otụtụ ụmụaka ebu n’afọ na-ami isi aka nri ha.

Akụkụ eriri afọ nọ n’ime eriri nwa abiaghachiwa n’ime oghere dị n’ime afọ.

Osifikeshionụ [ya bụ mgbe ihe niile eji akpụ ọkpụkpụ na-abanye n’ebe digasị iche iche na emekwa ka ọkpụkpụ sie ike

Mbọ aka na mbo ụkwụ amalitela tobe.

Akara mkpụrụaka pụrụ iche na-aputa ihie n’izu iri site na njikọta spam nwoke na akwa nwanyi gasịrị. Akara a nwere ike ịbụ ihe iruba ama na ndụ n’ile mmadụ.

Capítulo 39   11 semanas: absorbe glucosa y agua

N’izu iri na otu imi na egbugbere ọnụ etoputachaala nke ọma. Dika ọ di n’akụkụ ahụ ndị ọzọ, ọdịdi ha na-agbanwe n’ogo ọbụla nke mmadụ toruru na ndụ.

Eririafọ ebido mitawa glukos nakwa mmiri nke nwa ebu n’afọ loro.

N’agbanyeghi na ana-amata ma nwa ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyi na njiko spam nke nwoke na akwa nke nwanyi, ugbu a ihe nwoke na nwanyi ji enwe mmekọrita ke dị na mpụta aputachala nke ọma ugbua nke bụ na aga-amata ihe dị iche dị ka ọbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.
8 a 12 semanas